3 Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà ahụ,+ nwa Meri+ nakwa nwanne Jems+ na Josef na Judas na Saịmọn?+ Ọ̀ bụkwa na anyị na ụmụnne ya ndị inyom anọghị n’ebe a?” Ha wee malite ịsụ ngọngọ n’ihi ya.+
27 kama Chineke họọrọ ihe nzuzu nke ụwa,+ ka o wee menye ndị amamihe ihere; Chineke họkwaara ihe ndị na-adịghị ike nke ụwa, ka o wee menye ihe ndị dị ike ihere;+