31 N’ihi na m nụrụ olu yiri nke nwaanyị na-arịa ọrịa, mkpu ákwá nke na-ada ka nke nwaanyị na-amụ nwa mbụ ya,+ bụ́ olu ada bụ́ Zayọn, onye ọ na-esiri ike ikute ume. Ọ gbasara ọbụ aka ya,+ na-asị: “Efuola m, n’ihi na ike agwụwo mkpụrụ obi m n’ihi ndị na-egbu mmadụ!”+