21 Leenụ! ị tụkwasịwo obi ná nkwado nke ahịhịa amị a a zọturu azọtu,+ bụ́ Ijipt,+ ga-enye gị, nke ga-adụ mmadụ n’ọbụ aka wee dụpuo ya ma ọ bụrụ na ọ dabere na ya. Otú ahụ ka Fero+ eze Ijipt dị n’ebe ndị niile na-atụkwasị ya obi nọ.
31Ahụhụ ga-adịrị ndị na-agbada Ijipt ịga chọọ enyemaka,+ ndị na-adabere n’ịnyịnya efu,+ ndị na-atụkwasị obi n’ụgbọ ịnyịnya agha+ n’ihi na ha dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi n’ịnyịnya agha n’ihi na ha dị ike nke ukwuu, ma ha elekwasịghị Onye Nsọ Izrel anya, ha achọghịkwa Jehova.+
3 Otú ọ dị, ndị Ijipt bụ mmadụ,+ ha abụghị Chineke; ịnyịnya ha bụkwa anụ ahụ́,+ ha abụghị mmụọ. Jehova ga-esetịkwa aka ya, onye na-enye aka ga-asụ ngọngọ, onye a na-enyere aka ga-adakwa,+ ha niile ga-ala n’iyi n’otu mgbe.
11 Ọ ga-abata bibie ala Ijipt.+ Onye ọ bụla ajọ ọrịa ga-egbu, ajọ ọrịa ga-egbu ya, onye ọ bụla a ga-adọrọ n’agha, a ga-adọrọ ya n’agha, onye ọ bụla mma agha ga-egbu, mma agha ga-egbu ya.+