17 Ugboro ugboro ka ha na-asị ndị na-adịghị asọpụrụ m, ‘Jehova sịrị: “Udo ga-adịrị unu.”’+ Ha na-agwakwa onye ọ bụla nke na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ya si dị,+ sị, ‘Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị unu.’+
7 Ọ́ bụghị ọhụụ na-abụghị eziokwu ka unu hụrụ, ọ́ bụghịkwa ụgha unu jụtara n’ase ka unu kwuworo, mgbe unu na-asị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru,’ mgbe mụ onwe m na-ekwughị ihe ọ bụla?”’+
11 Ọ bụrụ na nwoke nke na-achụso ikuku ma na-agha ụgha ekwuo okwu ụgha,+ sị: “M ga-agwa unu okwu banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu,” ọ bụkwa ya ga na-agwa ndị a okwu.+
3 N’ihi na a ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anabata ozizi ahụ na-enye ezi ndụ,+ kama, dị ka ha si chọọ, ha ga-akpọkọtara onwe ha ndị ozizi ka ha wee na-anụ ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị;+