Diuterọnọmi 32:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ,+N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.+Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ;+Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.+ Abụ Ọma 18:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 N’ihi na ònye bụ Chineke ma e wezụga Jehova?+Ònyekwa bụ oké nkume ma e wezụga Chineke anyị?+ Abụ Ọma 95:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 95 Bịanụ ka anyị tikuo Jehova mkpu ọṅụ!+Ka anyị tikuo Oké Nkume nke nzọpụta anyị mkpu mmeri.+ Aịzaya 26:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Tụkwasịnụ Jehova obi+ mgbe niile, n’ihi na Jaa Jehova bụ Oké Nkume+ mgbe ebighị ebi.
4 Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ,+N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.+Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ;+Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.+