4 N’ihi ya, iwu adịkwaghị irè, a dịghị ekpe ikpe ziri ezi.+ Ọ bụ n’ihi na ndị ajọ omume gbara ndị ezi omume gburugburu, ọ bụ ya mere e ji na-agbagọ ikpe ziri ezi.+
15 “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ!+ n’ihi na unu na-agafe oké osimiri na ala akọrọ iji tọghata otu onye, mgbe ọ ghọkwara onye a tọghatara, unu na-eme ka o jiri okpukpu abụọ ghọọ onye a ga-atụba na Gehena* karịa unu.