37 “Ma ị ka dị ndụ, n’ihi na ọ hụrụ nna nna gị hà n’anya, nke mere na ọ họọrọ mkpụrụ ha ndị nọchiri ha+ wee jiri oké ike ya kpọpụta gị n’Ijipt n’ihu ya,+
15 Ọ bụ naanị na Jehova nwere mmasị n’ebe nna nna gị hà nọ ka o wee hụ ha n’anya, ọ bụ ya mere o ji họrọ ụmụ ha ndị nọchiri ha,+ ya bụ, unu, n’etiti ndị niile, dị ka ọ dị taa.
45 “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?+
13 Otú ọ dị, anyị aghaghị ịdị na-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu, ụmụnna anyị ndị Jehova hụrụ n’anya, n’ihi na Chineke họọrọ unu+ site ná mmalite ka e wee zọpụta unu, site n’iji mmụọ nsọ+ doo unu nsọ,+ sitekwa n’okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ.+