2 Jekọb wee gwa ezinụlọ ya, gwakwa ndị niile ya na ha nọ, sị: “Tụfuonụ chi ndị mba ọzọ dị n’etiti unu,+ meekwanụ onwe unu ka unu dị ọcha, gbanweekwanụ ákwà mgbokwasị unu,+
15 “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke mere ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ ihe arụ n’anya Jehova,+ ọrụ aka nke onye na-eji osisi na ígwè arụ ọrụ,+ onye debewokwara ya n’ebe zoro ezo.’ (Mmadụ niile ga-aza, sị, ‘Amen!’)+
4 O wee nyeghachi nne ya ọlaọcha ahụ, nne ya wee were narị mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe.+ O wee mee ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ;+ o wee dịrị n’ụlọ Maịka.