2 Jekọb wee gwa ezinụlọ ya, gwakwa ndị niile ya na ha nọ, sị: “Tụfuonụ chi ndị mba ọzọ dị n’etiti unu,+ meekwanụ onwe unu ka unu dị ọcha, gbanweekwanụ ákwà mgbokwasị unu,+
2 Jọshụa wee sị mmadụ niile: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụ n’ofe Osimiri+ ka nna nna unu hà,+ bụ́ Tira nna Ebreham na nna Nehọ,+ biri n’oge dị anya gara aga. Ha na-efebukwa chi ọzọ.
21 N’ihi na eze Babịlọn kwụụrụ otu ebe n’ebe ụzọ wara ngalaba, n’isi ụzọ abụọ, iji gbaa afa.+ Ọ yọgharịwo akụ́. O jiriwo terafim+ jụọ ase; o lewo anya n’imeju.
2 N’ihi na terafim+ ekwuwo okwu anwansi; ndị na-agba afa ahụwo ọhụụ ụgha,+ ọ bụ nrọ na-abaghị uru ka ha na-akọ, ọ bụkwa n’efu ka ha na-agbalị inye nkasi obi.+ Ọ bụ ya mere ha ga-eji nukọrọ pụọ dị ka ìgwè atụrụ;+ ha ga-enwe mmekpa ahụ́, n’ihi na e nweghị onye ọzụzụ atụrụ.+