11 Mozis wee welie aka kụọ mkpara ya na nkume ahụ dị elu ugboro abụọ: mmiri dị ukwuu wee malite ịgbapụta, nzukọ ahụ na anụ na-eburu ha ibu wee malite ịṅụ mmiri.+
15 I nyekwara ha achịcha nke si n’eluigwe n’ihi agụụ nke na-agụ ha,+ i mekwara ka mmiri si na nkume dị elu gbapụtara ha n’ihi akpịrị nke na-akpọ ha nkụ,+ i wee gwa ha ka ha banye+ ma nweta ala ahụ i weliri aka gị ṅụọ iyi na ị ga-enye ha.+