13 Ewetawo m ezi omume m nso.+ Ọ dịghị n’ebe dị anya,+ nzọpụta m agaghịkwa abịa mgbe oge gafeworo.+ M ga-eme ka e nwee nzọpụta na Zayọn, meekwa ka Izrel nweta ịma mma m.”+
17 n’ihi na ọ bụ na ya ka a na-ekpughe ezi omume nke Chineke+ n’ihi okwukwe+ mmadụ nwere, nke na-eme ka o nwekwuo okwukwe, dị nnọọ ka e dere, sị: “Ma onye ezi omume ga-esi n’okwukwe dị ndụ.”+