2 Jehova malitere ikwu okwu site n’ọnụ Hosia, Jehova wee sị Hosia: “Gaa+ lụrụ nwaanyị nke ga-akwa iko, mụọkwa ụmụ a kwatara n’iko, n’ihi na ọ bụ ịkwa iko mere ala a ji kwụsị iso Jehova.”+
20 “‘Otú ọ dị, ihe na-adịghị mma i mere bụ na ị gbachiri nwaanyị ahụ bụ́ Jezibel nkịtị,+ bụ́ onye na-akpọ onwe ya onye amụma, ọ na-akụzikwara+ ndị ohu m,+ na-eduhiekwa ha, ka ha na-akwa iko,+ ka ha na-erikwa ihe e ji chụọrọ arụsị àjà.+