5Gaanụ jegharịa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem ka unu lee, mata, chọọkwa n’ámá ya dị iche iche ma ọ̀ dị onye unu pụrụ ịhụ,+ ma è nwere onye na-eme ihe ziri ezi,+ onye ọ bụla nke na-achọ ikwesị ntụkwasị obi,+ m ga-agbagharakwa obodo a.
30 “‘M nọ na-achọ nwoke nke si n’etiti ha, bụ́ onye ga-arụzi mgbidi ahụ e ji nkume wuo,+ onye ga-eguzokwa n’ihu m maka ala ahụ n’ebe a kwaturu akwatu+ ná mgbidi ahụ, ka m wee ghara ibibi ya;+ ma ọ dịghị onye m hụrụ.
2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+