48Nụrụnụ ihe a, ụlọ Jekọb, unu ndị na-aza aha Izrel,+ ndị sikwa na mmiri Juda pụta,+ unu ndị na-eji aha Jehova aṅụ iyi,+ ndị na-akpọ aha Chineke Izrel,+ ma ọ bụghị n’eziokwu, ọ bụghịkwa n’ezi omume.+
4Ụmụ Izrel, nụrụnụ okwu Jehova, n’ihi na Jehova nwere okwu ikpe megide ndị bi n’ala a,+ n’ihi na eziokwu+ na obiọma* na ihe ọmụma banyere Chineke adịghị n’ala a.+