13 “N’ihi na onye ọ bụla n’ime ha na-enwetara onwe ya uru na-ezighị ezi, malite n’onye kasị nta ruo n’onye kasị ukwuu;+ onye ọ bụla na-aghọ aghụghọ, malite n’onye amụma ruo n’onye nchụàjà.+
2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+