26 Eze wee gwa Abayata+ onye nchụàjà, sị: “Laa n’ala gị dị n’Anatọt!+ N’ihi na i kwesịrị ọnwụ;+ ma agaghị m egbu gị taa, n’ihi na i buru igbe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova+ n’ihu Devid nna m,+ nakwa n’ihi na ị nọrọ ná mmekpa ahụ́ n’oge niile nna m nọ ná mmekpa ahụ́.”+