9 “Lee! Ụbọchị Jehova na-abịa, ụbọchị ebere na-agaghị adị n’ihi ọnụma na iwe dị ọkụ, iji mee ka ala a bụrụ ihe ijuanya,+ ka o wee kpochapụkwa ndị mmehie n’ala a.+
2 O wee jiri oké olu tie mkpu,+ sị: “Ọ dawo! Babịlọn Ukwu ahụ adawo,+ ọ ghọwokwa ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ na ebe zoro ezo nke ume ọ bụla e kupụrụ ekupụ+ nke na-adịghị ọcha na ebe zoro ezo nke anụ ufe niile na-adịghị ọcha, nke a kpọkwara asị!+