9 Nehemaya,+ ya bụ, Tesheta,+ na Ezra+ onye nchụàjà, ọkà n’idepụta ihe, na ndị Livaị bụ́ ndị na-akụziri ndị mmadụ ihe wee gwa mmadụ niile, sị: “Taa dị nsọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu nọ.+ Unu erula uju, unu akwala ákwá.”+ N’ihi na mmadụ niile nọ na-akwa ákwá mgbe ha na-anụ ihe e kwuru n’iwu ahụ.+