11 “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?” ka Jehova kwuru. “Àjà ebule+ a na-esurecha n’ọkụ+ nakwa abụba nke anụ mara abụba+ agbụla m; ọbara+ nwa oké ehi na nke nwa ebule na nke mkpi+ adịghịkwa atọ m ụtọ.+
13 “‘Omume rụrụ arụ dị n’adịghị ọcha gị.+ Ọ bụ ya mere m ji na-eme ka ị dị ọcha, ma ị hapụghị adịghị ọcha gị wee dị ọcha.+ Ị gaghị adị ọcha ọzọ ruo mgbe m mere ka iwe m na-eweso gị dajụọ.+
26 N’ihi na ọ bụrụ na anyị elezie anya+ na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ,+ ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie,+