24 E mesịa, eze Asiria si na Babịlọn+ na Kuta na Ava+ na Hemat+ na Sefaveyim+ kpọta ndị mmadụ, meekwa ka ha bichie ụmụ Izrel n’obodo ndị dị na Sameria;+ ha wee malite iweghara Sameria, birikwa n’obodo ya dị iche iche.
12 “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova rụchara ọrụ ya dum n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, m ga-eme ka eze Asiria zaa ajụjụ maka ihe obi nganga ya rụpụtara nakwa maka mpako nke anya ya dị elu.+
13 “Ọ ga-esetị aka ya n’ebe ugwu, ọ ga-ebibikwa Asiria.+ Ọ ga-emekwa ka Ninive bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ meekwa ka ógbè nke mmiri na-adịghị dị ka ala ịkpa.