17 ‘“Lee! Ụbọchị na-abịa, mgbe a ga-eburu ihe niile dị n’ụlọ gị,+ ihe nna nna gị hà kwakọbakwara ruo taa, laa Babịlọn.+ Ọ dịghị ihe ga-afọdụ,”+ ka Jehova kwuru.
13 O wee si n’ebe ahụ wepụta akụ̀ niile dị n’ụlọ Jehova na akụ̀ ndị dị n’ụlọ eze,+ o wee gburisịa arịa ọlaedo niile+ Sọlọmọn eze Izrel mere n’ụlọ nsọ Jehova, dị nnọọ ka Jehova kwuru.
13 Ndị Kaldia kụrisịkwara ogidi+ ọla kọpa ndị dị n’ụlọ Jehova, nakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ na oké osimiri e ji ọla kọpa rụọ,+ bụ́ ndị dị n’ụlọ Jehova, burukwa ọla kọpa e ji rụọ ha laa Babịlọn.+
25 Ndị amụma ya na-agba izu ọjọọ n’ime ya,+ dị nnọọ ka ọdụm nke na-ebigbọ ebigbọ, nke na-adọgbu anụ.+ Ha na-eripịa mkpụrụ obi.+ Ha nọ na-akpakọba akụ̀ na ihe dị oké ọnụ ahịa.+ Ha emewo ka ndị inyom di ha nwụrụ dị ọtụtụ n’ime ya.+