18 Arịa niile+ dị n’ụlọ ezi Chineke, ma ndị ukwu+ ma ndị nta, na akụ̀+ ndị dị n’ụlọ Jehova na akụ̀ eze+ na nke ndị o mere ndị isi, o buuru ha niile laa Babịlọn.
6 ‘Lee! Ụbọchị na-abịa, mgbe a ga-eburu ihe niile dị n’ụlọ gị, ihe nna nna gị hà kwakọbakwara ruo taa, laa Babịlọn.’+ ‘Ọ dịghị ihe ga-afọdụ,’+ ka Jehova kwuru.
5 M ga-enyefe ihe niile a kwakọbara n’obodo a na ihe niile e mepụtara na ya na ihe niile dị oké ọnụ ahịa dị n’ime ya n’aka ndị iro ha; m ga-enyefekwa akụ̀ niile nke ndị eze Juda n’aka ndị iro ha.+ Ha ga-akwakọrọ ha, bukọrọkwa ha laa Babịlọn.+
17 Ndị Kaldia kụrisịkwara ogidi ọla kọpa+ ndị dị n’ụlọ Jehova nakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ na oké osimiri e ji ọla kọpa rụọ+ bụ́ nke dị n’ụlọ Jehova ma buru ọla kọpa dum e ji rụọ ha laa Babịlọn.+
19 Onyeisi ndị nche ahụ bukọọrọ+ efere ukwu+ na ihe ịgụ ọkụ na ọkwá+ na ite na ihe ndọba oriọna+ na iko na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo mee+ na ndị nke e ji ezigbo ọlaọcha mee.+
2 Ka oge na-aga, Jehova nyefere Jehoyakim eze Juda+ na ụfọdụ n’ime arịa+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke n’aka ya, o wee bute ha n’ala Shaịna,+ n’ụlọ chi ya; o wee busa arịa ndị ahụ n’ụlọ a na-edebe akụ̀ nke chi ya.+