Aịzaya
39 N’oge ahụ, Merodak-baladan+ nwa Baladan bụ́ eze Babịlọn+ zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi na onyinye,+ mgbe ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma gbakee.+ 2 Hezekaya wee malite ịṅụrị ọṅụ na ha bịara,+ o wee gosi ha ụlọ a na-edebe akụ̀ ya,+ ọlaọcha na ọlaedo na mmanụ bọlsọm+ na ezigbo mmanụ na ngwá agha ya+ na ihe niile dị n’ebe a na-edebe akụ̀ ya. Ọ dịghị ihe Hezekaya na-egosighị ha n’ụlọ ya+ nakwa n’ebe niile ọ na-achị.+
3 E mesịa, Aịzaya onye amụma bịakwutere Eze Hezekaya wee sị ya:+ “Gịnị ka ndị ikom a kwuru, oleekwa ebe ha si bịakwute gị?” Hezekaya wee sị: “Ha si n’ala dị anya bịakwute m, ha si Babịlọn.”+ 4 O wee gaa n’ihu ịsị: “Gịnị ka ha hụrụ n’ụlọ gị?”+ Hezekaya wee zaa, sị: “Ha hụrụ ihe niile dị n’ụlọ m. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’ebe m na-edebe akụ̀ nke m na-egosighị ha.” 5 Aịzaya wee sị Hezekaya:+ “Nụrụ okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha, 6 ‘Lee! Ụbọchị na-abịa, mgbe a ga-eburu ihe niile dị n’ụlọ gị, ihe nna nna gị hà kwakọbakwara ruo taa, laa Babịlọn.’+ ‘Ọ dịghị ihe ga-afọdụ,’+ ka Jehova kwuru. 7 ‘A ga-akpọrọkwa+ ụfọdụ n’ime ụmụ gị ndị ikom ga-esi n’ahụ́ gị, bụ́ ndị ị gaje ịmụ, ha ga-aghọkwa ndị na-eje ozi+ n’obí eze Babịlọn.’”+
8 Hezekaya wee sị Aịzaya: “Okwu Jehova nke i kwuru dị mma.”+ O wee gaa n’ihu ịsị: “N’ihi na udo na eziokwu+ ga-adịgide n’ụbọchị m.”+