12 E mesịa, Jehoyakin eze Juda nyefere onwe ya n’aka eze Babịlọn,+ ya na nne ya+ na ndị na-ejere ya ozi na ndị o mere ndị isi na ndị na-eje ozi n’obí ya; eze Babịlọn wee kpụrụ ya laa n’afọ nke asatọ+ nke ọchịchị ya.
11 N’ikpeazụ, Jehova mere ka ndị isi agha nke eze Asiria+ buso ha agha.+ Ha wee nwụde Manase n’ọgba+ wee tụọ ya ịgà+ abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn.
12 “Biko, gwa ụlọ ahụ na-enupụ isi,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe ihe ndị a pụtara?’ Gwa ha, sị, ‘Lee! Eze Babịlọn bịara Jeruselem wee kpụrụ eze ya+ na ndị isi ya kpụga Babịlọn bụ́ ebe ya onwe ya nọ.+