22 Jehova ga-eme ka ị rịawa ụkwara nta+ na oké ahụ́ ọkụ na ọrịa ahụ́ ọzịza na oké okpomọkụ, meekwa ka mma agha+ bịakwasị gị, meekwa ka ihe ọkụkụ gị kpọnwụọ,+ meekwa ka ihe ọkụkụ gị maa ebù,+ ihe ndị a ga-achụkwa gị ọsọ ruo mgbe ị lara n’iyi.
24 Lee! Ndị mmadụ abịawo n’obodo a maa ékpè+ iji weghara ya,+ a ga-enyefekwa obodo a n’aka ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso ya agha,+ n’ihi mma agha+ na ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe;+ ihe i kwuru emewo, gị onwe gị na-ahụkwa ya.+
15 Mma agha dị n’èzí,+ e nwere ọrịa na-efe efe na ụnwụ n’ime ụlọ.+ A ga-eji mma agha gbuo onye ọ bụla nọ n’ubi, ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịakwa ndị nọ n’ime obodo.+