10 Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Lee, m ga-ezi ozi, m ga-akpọrọ Nebukadreza eze Babịlọn,+ bụ́ ohu m,+ m ga-edebe ocheeze ya kpọmkwem n’elu nkume ndị a m zoro, ọ ga-agbasakwa ụlọikwuu ọma ya n’elu ha.
18 “Nwa nke mmadụ, Nebukadreza,+ bụ́ eze Babịlọn, mere ka ndị agha ya lụso Taya agha dị ukwuu.+ E mere ka isi niile kwọchaa, chihịakwa ubu niile.+ Ma ọ dịghị ụgwọ+ ọ bụla Taya kwụrụ ya na ndị agha ya maka agha o busoro ya.