30 “‘Ya mere, ọ bụ dị ka ụzọ onye ọ bụla si dị ka m ga-ekpe unu ikpe,+ ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Chigharịanụ, ee, hapụnụ mmebi iwu unu niile,+ ka ihe ọ bụla gharakwa ịbụrụ unu ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpata njehie.+
2 m ga-achịkọtakwa mba niile+ ma mee ka ha gbadata na ndagwurugwu Jehọshafat;+ m ga-ekpe ha ikpe n’ebe ahụ n’ihi ndị m nakwa n’ihi ihe nketa m bụ́ Izrel,+ bụ́ ndị ha chụsasịrị ná mba dị iche iche; ha kesakwara ala m.+