10 Ha alaghachiwo ná njehie ndị nna nna ha,+ ndị nke mbụ, ndị jụrụ irube isi n’ihe m kwuru, kama ha sooro chi ọzọ dị iche iche ka ha wee fee ha.+ Ụlọ Izrel na ụlọ Juda emebiwo ọgbụgba ndụ m nke mụ na ndị nna nna ha gbara.+
17 O wee gaa n’ihu ịsị m: “Ị̀ hụla ihe a, nwa nke mmadụ? Ihe arụ niile ụlọ Juda meworo n’ebe a ọ̀ bụụrụ ha ntakịrị ihe, nke na ha na-eme ka ime ihe ike jupụta n’ala a,+ ka ha wee kpasuo m iwe ọzọ? Lee, ha na-adụ m alaka osisi n’imi.