16 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Lee! Ị ga-esoro nna nna gị hà dinaa;+ ndị a ga-ebilikwa,+ ha na chi ọzọ ndị dị n’etiti ha, n’ala ahụ ha na-aga,+ ga-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, ha ga-ahapụkwa m+ ma mebie ọgbụgba ndụ m nke mụ na ha gbara.+
7 O wee ruo na n’ihi na ụmụ Izrel mehiere+ Jehova bụ́ Chineke ha, bụ́ onye kpọpụtara ha n’ala Ijipt n’aka Fero eze Ijipt,+ ha wee malite ịtụ egwu chi ọzọ;+
59 “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Mụ onwe m ga-emekwa gị ihe i mere,+ n’ihi na i ledara iyi ị ṅụrụ anya site n’imebi ọgbụgba ndụ m.+
9 ọ gaghị adị ka ọgbụgba ndụ+ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’ala Ijipt kpọpụta ha,+ n’ihi na ha anọgideghị n’ọgbụgba ndụ m,+ nke mere na m kwụsịrị ilekọta ha,’ ka Jehova kwuru.”+