29 N’ihi na m maara nke ọma na mgbe m nwụsịrị, unu ga-emerịrị omume na-eweta mbibi,+ unu ga-ahapụkwa ụzọ ahụ m nyere unu iwu ka unu soro; ọdachi+ ga-adakwasịkwa unu ná ngwụsị ụbọchị ndị ahụ, n’ihi na unu ga-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova iji kpasuo ya iwe site n’ihe aka unu ga-arụ.”+
16 n’ihi na unu mebiri ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu nke o nyere unu n’iwu, nakwa n’ihi na unu agawo fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala.+ Jehova ga-eweso unu iwe dị ọkụ,+ unu ga-alakwa n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ezi ala a nke o nyere unu.”+
26 “Otú ọ dị, ha ghọrọ ndị nnupụisi+ wee meere gị isi ike+ ma na-eleghara iwu gị anya,+ ha gbukwara ndị amụma gị,+ bụ́ ndị gbara àmà megide ha iji mee ka ha laghachikwute gị;+ ha wee na-eme omume nlelị dị ukwuu.+