7 M ga-enye ha obi ha ga-eji mara m,+ na mụ onwe m bụ Jehova; ha ga-abụ ndị m,+ mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha, n’ihi na ha ga-eji obi ha dum lọghachikwute m.+
33 “N’ihi na nke a bụ ọgbụgba ndụ+ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị,”+ ka Jehova kwuru. “M ga-etinye iwu m n’ime ha,+ m ga-edekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.”+
5 N’ihi na ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya;+ ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị+ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+