12 M ga-enyefe unu n’aka mma agha.+ Unu niile ga-ehulata ala ka e gbuo unu;+ n’ihi na m kpọrọ òkù,+ ma unu azaghị; ekwuru m okwu, ma unu egeghị ntị;+ unu nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya m,+ ọ bụkwa ihe na-adịghị m mma ka unu họọrọ ime.”+
4 Mụ onwe m ga-ahọrọ ụzọ m ga-esi mesie ha ike;+ m ga-emekwa ka ihe ha na-atụ ụjọ bịakwasị ha;+ n’ihi na m kpọrọ òkù, ma ọ dịghị onye zara; ekwuru m okwu, ma ọ dịghị onye gere ntị;+ ha nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya m, ọ bụkwa ihe na-adịghị m mma ka ha họọrọ ime.”+
13 Ebe ọ bụ na unu nọ na-eme ihe ndị a,’ ka Jehova kwuru, ‘mụ onwe m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu egeghị ntị,+ m nọkwa na-akpọ unu òkù, ma unu azaghị,+
33 Ha wee gbakụta m azụ, ha echeghị ihu n’ebe m nọ;+ ọ bụ ezie na m nọ na-ezi ha ihe, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezi ha ihe, ma ọ dịghị onye n’ime ha gere ntị wee nara ịdọ aka ná ntị.+