36 Jehoyakim+ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri na otu na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Zebaịda nwa Pedaya bụ́ onye si Ruma.
25Nke a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile n’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ya bụ, n’afọ mbụ nke ọchịchị Nebukadreza, bụ́ eze Babịlọn;