2 M ga-eziga ndị na-afụcha ihe na Babịlọn, ha ga-afụcha ya ma mee ka ala ya tọgbọrọ n’efu;+ n’ihi na ha ga-esi n’akụkụ niile megide ya n’ụbọchị ọdachi.+
12 Gwunyenụ ihe mgbaàmà megide mgbidi Babịlọn.+ Chesienụ nche ike.+ Debenụ ndị nche. Meenụ ka e nwee ndị gara zoo.+ N’ihi na Jehova echepụtawo ya, ọ ga-emekwa ihe o kwuru ọ ga-eme ndị bi na Babịlọn.”+