3 Ọ bụ ya mere ala a ga-eji ruo uju,+ onye ọ bụla bi n’ime ya ga-atụbọ, tinyere anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe, ọbụna azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-anwụ.+
3 “M ga-ekpochapụ mmadụ na anụmanụ.+ M ga-ekpochapụ anụ ufe nke eluigwe na azụ̀ ndị dị n’oké osimiri,+ na ihe ịsụ ngọngọ, tinyere ndị ajọ omume;+ m ga-egbuchapụkwa mmadụ n’elu ala,”+ ka Jehova kwuru.