4 Ruo ole mgbe ka ala a ga-anọ na-akpọ nkụ,+ ruokwa ole mgbe ka ahịhịa dị n’ala dum ga-anọ na-akpọnwụ?+ E kpochapụwo anụmanụ na anụ ufe n’ihi ihe ọjọọ ndị bi na ya na-eme.+ N’ihi na ha asịwo: “Ọ dịghị ahụ ọdịnihu anyị.”
3 Ọ bụ ya mere ala a ga-eji ruo uju,+ onye ọ bụla bi n’ime ya ga-atụbọ, tinyere anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe, ọbụna azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-anwụ.+