17 Ugboro ugboro ka ha na-asị ndị na-adịghị asọpụrụ m, ‘Jehova sịrị: “Udo ga-adịrị unu.”’+ Ha na-agwakwa onye ọ bụla nke na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ya si dị,+ sị, ‘Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị unu.’+
10 n’ihi na, n’ezie, ha eduhiewo ndị m, na-asị, “Udo dị!” mgbe udo na-adịghị,+ e nwekwara onye na-ewu ahụ́ ụlọ, ma n’efu+ ka ndị na-ete ya nzụ na-ete ya.’+
11 Ndị isi ya anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị,+ ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,+ ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego;+ ma n’ebe Jehova nọ ka ha dabeere, na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+