Diuterọnọmi 4:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 Mgbe ị nọ n’oké ihe isi ike, okwu a niile ewee mezuo n’isi gị mgbe ụbọchị ndị ahụ gwụwara, mgbe ahụ, ị ga-alaghachikwute Jehova bụ́ Chineke+ gị wee gee ntị n’olu ya.+ Aịzaya 55:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+ Hosia 6:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 “Bịanụ, ka anyị laghachikwuru Jehova,+ n’ihi na ya onwe ya adọrisịwo anyị,+ ma ọ ga-agwọ anyị.+ Ọ nọ na-eti anyị ihe, ma ọ ga-ekechi ọnyá anyị.+ Joel 2:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Dọwaakwanụ obi unu,+ ọ bụghị uwe unu;+ lọghachikwutenụ Jehova bụ́ Chineke unu, n’ihi na ọ na-eme amara, na-emekwa ebere,+ ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ obiọma*+ ya dịkwa ukwuu, ọdachi ahụ ga-ewutekwa ya.+ Jems 4:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.+ Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie,+ meekwanụ ka obi unu dị ọcha,+ unu ndị nwere uche abụọ.+
30 Mgbe ị nọ n’oké ihe isi ike, okwu a niile ewee mezuo n’isi gị mgbe ụbọchị ndị ahụ gwụwara, mgbe ahụ, ị ga-alaghachikwute Jehova bụ́ Chineke+ gị wee gee ntị n’olu ya.+
7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+
6 “Bịanụ, ka anyị laghachikwuru Jehova,+ n’ihi na ya onwe ya adọrisịwo anyị,+ ma ọ ga-agwọ anyị.+ Ọ nọ na-eti anyị ihe, ma ọ ga-ekechi ọnyá anyị.+
13 Dọwaakwanụ obi unu,+ ọ bụghị uwe unu;+ lọghachikwutenụ Jehova bụ́ Chineke unu, n’ihi na ọ na-eme amara, na-emekwa ebere,+ ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ obiọma*+ ya dịkwa ukwuu, ọdachi ahụ ga-ewutekwa ya.+
8 Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.+ Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie,+ meekwanụ ka obi unu dị ọcha,+ unu ndị nwere uche abụọ.+