10 n’ihi na ị ga-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị iji debe ihe o nyere n’iwu na ụkpụrụ ya ndị e dere n’akwụkwọ iwu a,+ n’ihi na ị ga-eji obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke gị.+
13 O wee na-ekpeku ya ekpere, nke mere na ọ nabatara+ arịrịọ ya. O wee nụ arịrịọ ọ na-arịọ ka e meere ya amara. O wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya;+ Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+
9 Mgbe unu laghachikwutere m,+ debekwa ihe niile m nyere n’iwu+ ma mee ha,+ ọ bụrụgodị na ndị unu a chụsasịrị achụsasị nọ na nsọtụ eluigwe, m ga-esi n’ebe ahụ chịkọta+ ha, kpọlatakwa ha+ n’ebe ahụ m họọrọ ime ka aha m biri na ya.’+