20 Ugbu a, onyenwe m eze, biko, gee ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m na-arịọ ka i meere m amara,+ akpọghachila m n’ụlọ Jehọnatan+ bụ́ odeakwụkwọ, ka m ghara ịnwụ n’ebe ahụ.”+
6 Ha wee kpọrọ Jeremaya tụba ya n’olulu Malkaịja+ nwa eze, nke dị n’Ogige Ndị Nche.+ Ha wee were ụdọ seda Jeremaya n’olulu ahụ. Mmiri adịghị n’olulu ahụ, kama ọ bụ apịtị dị ya; Jeremaya wee mikpuo n’apịtị ahụ.+