15 Osisi ogwu wee sị osisi ndị ọzọ, ‘Ọ bụrụ na unu ji ezi obi na-ahọpụta m ịbụ eze unu, bịanụ, gbabanụ na ndò m.+ Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ka ọkụ+ si n’osisi ogwu pụta repịa osisi sida+ nke Lebanọn.’+
12 Akwụkwọ ya mara mma, mkpụrụ ya dịkwa ọtụtụ, ihe oriri nke na-ezuru ihe niile dịkwa n’elu ya. Anụ ọhịa+ na-anọ na ndò dị n’okpuru ya,+ ọ bụkwa n’alaka ya ka anụ ufe nke eluigwe bi,+ anụ ahụ́ niile na-erikwa ihe si na ya.