44 Ma n’agbanyeghị ihe a dum, mgbe ha nọ n’ala ndị iro ha, agaghị m ajụ ha,+ agaghịkwa m akpọ ha asị+ wee kpochapụ ha, mebie ọgbụgba ndụ+ mụ na ha; n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha.
52Teta, teta, yiri ike gị dị ka uwe,+ gị Zayọn! Yiri uwe gị mara mma,+ gị Jeruselem, bụ́ obodo nsọ!+ N’ihi na onye a na-ebighị úgwù na onye na-adịghị ọcha agaghị abata n’ime gị ọzọ.+
18 “A gakwaghị anụ banyere ime ihe ike n’ala gị, ma ọ bụ nụ banyere ibukọrọ ihe mmadụ na itikpọ ihe n’ókè nke ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto.