Ilu 14:34 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 34 Ọ bụ ezi omume na-ebuli mba elu,+ ma mmehie bụụrụ mba dị iche iche ihe ihere.+ Aịzaya 3:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Otú ihu ha dị na-agbagide ha akaebe,+ ha na-ekwukwa banyere mmehie ha nke dị ka nke Sọdọm.+ Ha adịghị ezo ya ezo. Ahụhụ ga-adịrị mkpụrụ obi ha! N’ihi na ha ewetaworo onwe ha ọdachi.+ Aịzaya 59:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 N’ihi na nnupụisi anyị adịla ọtụtụ n’ihu gị;+ nke ọ bụla n’ime mmehie anyị agbawo akaebe megide anyị.+ N’ihi na anyị na nnupụisi anyị nọ; anyị makwaara njehie anyị nke ọma.+
9 Otú ihu ha dị na-agbagide ha akaebe,+ ha na-ekwukwa banyere mmehie ha nke dị ka nke Sọdọm.+ Ha adịghị ezo ya ezo. Ahụhụ ga-adịrị mkpụrụ obi ha! N’ihi na ha ewetaworo onwe ha ọdachi.+
12 N’ihi na nnupụisi anyị adịla ọtụtụ n’ihu gị;+ nke ọ bụla n’ime mmehie anyị agbawo akaebe megide anyị.+ N’ihi na anyị na nnupụisi anyị nọ; anyị makwaara njehie anyị nke ọma.+