18 Ọ bụrụ na mụ abanye n’ọhịa, lee, e nwere ndị mma agha gburu!+ Ọ bụrụkwa na mụ abata n’ime obodo, lee, ụnwụ akpatawokwa ọrịa!+ N’ihi na ma ndị amụma ma ndị nchụàjà awagharịwo banye n’ala ha na-amaghị.’”+
21 Ya mere, nyefee ụmụ ha n’aka ụnwụ,+ nyefeekwa ha n’aka mma agha;+ ka ndị nwunye ha ghọọ ụmụ nwaanyị gba aka ụmụ na ndị inyom di ha nwụrụ.+ Ka ajọ ọrịa gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbuokwa ụmụ okorobịa ha n’agha.+
15 Mma agha dị n’èzí,+ e nwere ọrịa na-efe efe na ụnwụ n’ime ụlọ.+ A ga-eji mma agha gbuo onye ọ bụla nọ n’ubi, ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịakwa ndị nọ n’ime obodo.+