23 Ụmụ Amọn na Moab wee buso ndị bi n’ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu+ agha wee bibie ha ma laa ha n’iyi; ozugbo ha lasịrị ndị bi na Sia n’iyi, ha gburịtara onwe ha.+
16 “‘Mgbe m ga-ezipụ ajọ akụ́ bụ́ ụnwụ ka ọ bịakwasị unu,+ nke ga-abụ maka mbibi, ya bụ, akụ́ m ga-ezipụ ka o bibie unu,+ m ga-emekwa ka ụnwụ dị ukwuu n’ala unu, m ga-agbajisị mkpara unu ji ekonye achịcha.+