12 “Biko, gwa ụlọ ahụ na-enupụ isi,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe ihe ndị a pụtara?’ Gwa ha, sị, ‘Lee! Eze Babịlọn bịara Jeruselem wee kpụrụ eze ya+ na ndị isi ya kpụga Babịlọn bụ́ ebe ya onwe ya nọ.+
10 Ọ sịrị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke alaeze Chineke, ma a na-eji ihe atụ agwa ndị ọzọ okwu,+ ka ha wee na-ele anya ma na-ele na nkịtị, ka ha wee na-anụ ihe ma ghara ịghọta ihe ọ pụtara.+