14 N’ihi na a gbahapụwo ụlọ elu ya,+ mkpọtụ nke na-eme n’obodo akwụsịwo; Ofel+ na ụlọ nche aghọwo ala tọgbọrọ nkịtị, bụ́ ebe ịnyịnya ọhịa na-aṅụrị ọṅụ, ebe ìgwè anụ ga na-ata nri ruo mgbe a na-akaghị aka;
14 Ọ bụkwa na ya ka ìgwè anụmanụ ga-amakpu, bụ́ anụ ọhịa niile dị ná mba dị iche iche.+ Ma okwolo ma ebi ogwu+ ga-anọbọ chi n’isi ogidi+ ya. A ga na-anụ ubé nnụnụ* na windo ya. A gaje ịla ihe n’iyi n’ụzọ mbata ya; n’ihi na ọ ga-ewepụsị osisi e ji kụchie ya.+