Aịzaya
32 Lee! Otu eze+ ga-achị ka e wee nwee ezi omume;+ ndị isi ga-achịkwa+ dị ka ndị isi ka e wee nwee ikpe ziri ezi. 2 Onye nke ọ bụla ga-adị ka ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo,+ dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị,+ dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.+
3 A gaghịkwa anyachi anya ndị na-ahụ ụzọ, ntị nke ndị na-anụ ihe ga-egekwa ntị.+ 4 Obi nke ndị na-eme oké ngwa ngwa ga-echebara ihe ọmụma echiche,+ ọbụna ire ndị nsụ ga na-ekwu ihe doro anya n’ụzọ na-aga were were.+ 5 A gakwaghị akpọ onye nzuzu onye na-emesapụ aka; a gaghịkwa asị na onye arụrụala bụ onye a na-asọpụrụ;+ 6 n’ihi na onye nzuzu ga na-ekwu okwu nzuzu,+ obi ya ga na-echepụta ihe ọjọọ+ iji si n’ezi ofufe dapụ,+ na-ekwukwa okwu ọjọọ megide Jehova, ime ka afọ nke mkpụrụ obi agụụ na-agụ tọgbọrọ chakoo,+ ọ na-emekwa ka ọbụna onye akpịrị na-akpọ nkụ ghara ịṅụ mmiri. 7 Ngwá ọrụ nke onye arụrụala dị njọ.+ O nyewo ndụmọdụ ka e mee omume rụrụ arụ,+ iji were okwu ụgha bibie ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,+ ọbụna mgbe ogbenye kwuru ihe ziri ezi.
8 Ma onye na-emesapụ aka enyewo ndụmọdụ ka e mesapụ aka; ọ ga-ebilikwa ọtọ ịkwado mmesapụ aka.+
9 “Unu ndị inyom obi ruru ala, bilienụ ọtọ gee ntị n’olu m!+ Unu ndị inyom na-adịghị echegbu onwe unu, ṅaanụ ntị n’ihe m na-ekwu! 10 Tupu otu afọ na ụbọchị ole na ole agafee, unu ndị na-adịghị echegbu onwe unu ga-ama jijiji,+ n’ihi na ịghọ mkpụrụ vaịn ga-akwụsịworị ma ọ dịghị mkpụrụ a tụtụkọtara.+ 11 Maanụ jijiji, unu ndị inyom obi ruru ala! Maanụ jijiji, unu ndị na-adịghị echegbu onwe unu! Yipụnụ uwe unu gbara ọtọ, keenụ ákwà iru uju n’úkwù.+ 12 Tienụ aka n’obi, kwaara ubi dị iche iche mara mma+ ákwà arịrị,+ kwaakwaranụ osisi vaịn nke na-amị mkpụrụ ákwà. 13 Ọ bụ naanị ogwu, ya bụ, osisi bụ́ ogwu ogwu, na-epulite n’ala ndị m,+ n’ihi na o puru n’elu ụlọ niile aṅụrị jupụtara na ha, ee, obodo nke nwere obi ụtọ dị ukwuu.+ 14 N’ihi na a gbahapụwo ụlọ elu ya,+ mkpọtụ nke na-eme n’obodo akwụsịwo; Ofel+ na ụlọ nche aghọwo ala tọgbọrọ nkịtị, bụ́ ebe ịnyịnya ọhịa na-aṅụrị ọṅụ, ebe ìgwè anụ ga na-ata nri ruo mgbe a na-akaghị aka; 15 ruo mgbe e si n’eluigwe wụkwasị anyị mmụọ,+ mgbe ala ịkpa ghọrọ ubi mkpụrụ osisi, e werekwa ubi mkpụrụ osisi dị ka ezigbo oké ọhịa.+
16 “Ikpe ziri ezi ga-ebikwa n’ala ịkpa, ezi omume ga-ebikwa n’ubi mkpụrụ osisi.+ 17 Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo;+ ihe ga-esikwa n’ezi omume ahụ pụta bụ ịnọ jụụ na ịnọ n’obi iru ala ruo mgbe ebighị ebi.+ 18 Ndị m ga-ebikwa n’ebe obibi nke udo dị nakwa n’ụlọ nke ha ga-ebi n’obi iru ala zuru ezu nakwa n’ebe izu ike nke nsogbu na-adịghị.+ 19 Akụ́ mmiri ígwé ga na-ada mgbe oké ọhịa dara,+ a ga-eweda obodo a n’ala kpamkpam.+
20 “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị na-akụ mkpụrụ n’akụkụ mmiri niile,+ ndị na-atọhapụ ụkwụ ehi na ụkwụ ịnyịnya ibu.”+