18 “A gakwaghị anụ banyere ime ihe ike n’ala gị, ma ọ bụ nụ banyere ibukọrọ ihe mmadụ na itikpọ ihe n’ókè nke ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto.
22 Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya. N’ihi na dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ;+ ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.+
25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo,+ m ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa ghara ịdịkwa n’ala ha,+ ha ga-ebikwa n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.+
18 Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+