23 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ebe ọ bụla a na-enwebu otu puku osisi vaịn, ndị ọnụ ahịa ha bụ otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha,+ osisi ogwu na ahịhịa ga na-adị na ya.+
13 “‘Mgbe m ga-achịkọta ha, m ga-eme ka ha gwụ,’ ka Jehova kwuru.+ ‘Mkpụrụ agaghị adị n’osisi vaịn,+ mkpụrụ agaghịkwa adị n’osisi fig, akwụkwọ ha ga-akpọnwụkwa. Ihe m na-enye ha ga-agafere ha.’”
12 M ga-eme ka osisi vaịn ya+ na osisi fig ya+ tọgbọrọ n’efu, bụ́ ndị o kwuru banyere ha, sị: “Ha bụ onyinye ndị mụ na ha na-eme enyi nyere m”; m ga-emekwa ka ha dị ka oké ọhịa,+ anụ ọhịa ga-erichapụ ha.
13 A ga-akwakọrọ akụ̀ ha, meekwa ka ụlọ ha tọgbọrọ n’efu.+ Ha ga-ewu ụlọ ma ha agaghị ebi n’ime ha;+ ha ga-akọkwa ubi vaịn ma ha agaghị aṅụ mmanya ya.+